11 Jehova wee gwa Mozis okwu ihu na ihu,+ dị nnọọ ka mmadụ si agwa mmadụ ibe ya okwu. Mgbe ọ laghachiri n’ebe ha mara ụlọikwuu, onye ozi ya+ bụ́ Jọshụa, nwa Nọn,+ dị ka onye na-eje ozi, adịghị esi n’ime ụlọikwuu ahụ apụ.
3 Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị na-ebutere gị ụzọ ka ị na-agafe.+ Ya onwe ya ga-ala mba ndị a n’iyi n’ihu gị, ị ga-achụpụkwa ha.+ Ọ bụ Jọshụa ga-ebutere gị ụzọ ka ị na-agafe,+ dị nnọọ ka Jehova kwuru.