28 Mee Jọshụa onye ndú,+ gbaakwa ya ume ma mee ka ọ dị ike, n’ihi na ọ bụ ya ga-ebutere ndị a ụzọ mgbe ha na-agafe,+ ọ bụkwa ya ga-eme ka ha nweta ala ahụ ị ga-ahụ.’+
45 Nna nna anyị hà, bụ́ ndị ọzọ nwetara ya, bubakwara ya, ha na Jọshụa,+ n’ala ahụ nke bụ́ nke ndị mba ọzọ,+ bụ́ ndị Chineke chụpụrụ n’ihu nna nna anyị hà.+ Ọ dịgidere n’ebe a ruo n’ụbọchị Devid.