23 N’ihi na mmụọ ozi m ga-ebutere gị ụzọ, n’ezie, ọ ga-akpọbata gị n’ala ndị Amọraịt na nke ndị Het na nke ndị Perizaịt na nke ndị Kenan, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs, m ga-ekpochapụkwa ha.+
7“Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-emesị kpọbata gị n’ala ahụ ị na-abanye inweta,+ ọ ga-ekpochapụ mba ndị nwere ụba mmadụ n’ihu gị,+ bụ́ ndị Het+ na ndị Gegash+ na ndị Amọraịt+ na ndị Kenan+ na ndị Perizaịt+ na ndị Haịvaịt+ na ndị Jibọs,+ mba asaa ndị nwere ụba mmadụ ma dị ike karịa gị.+
8 Devid wee kwuo n’ụbọchị ahụ, sị: “Onye ọ bụla nke ga-ebuso ndị Jibọs agha,+ ya site n’ọwa mmiri+ zute ma ndị ngwọrọ ma ndị ìsì, ndị mkpụrụ obi Devid kpọrọ asị!” Ọ bụ ya mere ha ji asị: “Onye ìsì na onye ngwọrọ agaghị abata n’ụlọ a.”