23 Oleekwa mba dị n’ụwa nke dị ka ndị gị Izrel,+ bụ́ ndị Chineke gara gbapụtara onwe ya ka ha bụrụ ndị ya,+ iji meere onwe ya aha+ nakwa iji meere ha oké ihe na ihe dị egwu+—iji chụpụ mba dị iche iche na chi ha n’ihi ndị gị, bụ́ ndị i si n’Ijipt gbapụtara+ onwe gị?
16 N’ihi na ị bụ Nna anyị;+ ọ bụ ezie na o nwere ike ịbụ na Ebreham amaghị anyị, o nwekwara ike ịbụ na Izrel amaghị anyị, gị onwe gị, Jehova, bụ Nna anyị. Onye Mgbapụta anyị kemgbe oge dị anya gara aga bụ aha gị.+