18 N’ụbọchị ahụ, Jehova na Ebram gbara ndụ,+ o wee sị: “Ọ bụ mkpụrụ gị ka m ga-enye ala a,+ malite n’osimiri Ijipt ruo n’osimiri ukwu, bụ́ osimiri Yufretis:+
24 N’ihi na m ga-achụpụ mba dị iche iche n’ihu gị,+ m ga-emekwa ka ókèala gị saa mbara;+ ọ dịghịkwa onye ọ ga-agụ agụụ iwere ala gị mgbe ị na-agbago ịhụ ihu Jehova bụ́ Chineke gị ugboro atọ n’afọ.+
24 Ebe ọ bụla ọbụ ụkwụ unu ga-azọ ga-abụ nke unu.+ Ókè nke ala unu ga-amalite n’ala ịkpa ruo Lebanọn, malite n’Osimiri, bụ́ Osimiri Yufretis, ruo n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.+