Diuterọnọmi 12:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-eme ka ókèala gị saa mbara,+ dị nnọọ ka o kwere gị ná nkwa,+ ị ga-asịkwa, ‘Ka m rie anụ,’ n’ihi na ọ na-agụ mkpụrụ obi gị agụụ iri anụ, ị ga-eri anụ mgbe ọ bụla ọ gụrụ mkpụrụ obi gị agụụ.+ Abụ Ọma 78:55 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 55 O ji nwayọọ nwayọọ chụpụ mba dị iche iche n’ihi ha,+Jirikwa eriri e ji atụ̀ ihe kenye ha ihe nketa,+O wee mee ka ebo dị iche iche nke Izrel biri n’ụlọ nke ha.+
20 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-eme ka ókèala gị saa mbara,+ dị nnọọ ka o kwere gị ná nkwa,+ ị ga-asịkwa, ‘Ka m rie anụ,’ n’ihi na ọ na-agụ mkpụrụ obi gị agụụ iri anụ, ị ga-eri anụ mgbe ọ bụla ọ gụrụ mkpụrụ obi gị agụụ.+
55 O ji nwayọọ nwayọọ chụpụ mba dị iche iche n’ihi ha,+Jirikwa eriri e ji atụ̀ ihe kenye ha ihe nketa,+O wee mee ka ebo dị iche iche nke Izrel biri n’ụlọ nke ha.+