22 mgbe onye amụma ahụ ji aha Jehova kwuo okwu, ma okwu ahụ emeghị, o mezughịkwa, nke ahụ bụ okwu ọ na-abụghị Jehova kwuru. Onye amụma ahụ ji mpako kwuo ya.+ Atụla ya ụjọ.’+
13 “N’ihi na onye ọ bụla n’ime ha na-enwetara onwe ya uru na-ezighị ezi, malite n’onye kasị nta ruo n’onye kasị ukwuu;+ onye ọ bụla na-aghọ aghụghọ, malite n’onye amụma ruo n’onye nchụàjà.+
4 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ihere ga-eme ndị amụma,+ ihere ga-eme onye nke ọ bụla n’ihi ọhụụ ọ hụrụ mgbe ọ na-ebu amụma; ha agaghịkwa eyi uwe ndị amụma e ji ajị anụ mee+ iji na-aghọgbu ndị mmadụ.