Diuterọnọmi 17:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 e wee kọọrọ gị ya, i wee nụ ya ma nyochaa ya nke ọma, ma, lee! o doro anya na ọ bụ eziokwu,+ na e mewo ihe arụ a n’Izrel! Diuterọnọmi 19:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 “Naanị otu onye akaebe agaghị ebili gbagide mmadụ akaebe n’ihe metụtara njehie ọ bụla ma ọ bụ mmehie ọ bụla,+ n’ihe banyere mmehie ọ bụla o mere. N’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ n’ọnụ ndị akaebe atọ ka a ga-ama na okwu bụ eziokwu.+ 1 Timoti 5:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Ekwetala ebubo e boro okenye, ọ gwụla naanị ma è nwere akaebe nke ndị àmà abụọ ma ọ bụ atọ gbara.+ Ndị Hibru 10:28 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 28 A na-egbu onye ọ bụla ledara iwu Mozis anya n’enweghịrị ya ọmịiko, mgbe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbagidere ya akaebe.+
4 e wee kọọrọ gị ya, i wee nụ ya ma nyochaa ya nke ọma, ma, lee! o doro anya na ọ bụ eziokwu,+ na e mewo ihe arụ a n’Izrel!
15 “Naanị otu onye akaebe agaghị ebili gbagide mmadụ akaebe n’ihe metụtara njehie ọ bụla ma ọ bụ mmehie ọ bụla,+ n’ihe banyere mmehie ọ bụla o mere. N’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ n’ọnụ ndị akaebe atọ ka a ga-ama na okwu bụ eziokwu.+
19 Ekwetala ebubo e boro okenye, ọ gwụla naanị ma è nwere akaebe nke ndị àmà abụọ ma ọ bụ atọ gbara.+
28 A na-egbu onye ọ bụla ledara iwu Mozis anya n’enweghịrị ya ọmịiko, mgbe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbagidere ya akaebe.+