43 Unu ejila ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè mee ka mkpụrụ obi unu bụrụ ihe na-asọ oyi, unu ekwela ka ha mee ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ha ewee mee ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha.+
25 Unu ga-akpakwa ókè n’agbata anụ dị ọcha na nke na-adịghị ọcha nakwa n’agbata anụ ufe na-adịghị ọcha na nke dị ọcha;+ unu ejikwala anụ ọhịa na anụ ufe na ihe ọ bụla na-agagharị agagharị n’elu ala, bụ́ ndị m gụpụrụ agụpụ site n’ikwu na ha adịghị ọcha, mee ka mkpụrụ obi unu bụrụ ihe na-asọ oyi.+
14 M wee sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee! E merụghị mkpụrụ obi m emerụ;+ eritụbeghị m anụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ anụ a dọgburu adọgbu malite n’oge m bụ nwata,+ ọbụna ruo ugbu a, anụ rụrụ arụ abatụbeghị m n’ọnụ.”+