11 Izrel emehiewo, ha emebiwokwa ọgbụgba ndụ m+ nke m nyere ha n’iwu; ha ewerewokwa ụfọdụ n’ime ihe a ga-ebibi ebibi,+ ha ezuwo ohi+ ma kpuchie ya,+ tinyekwa ya n’arịa ha.+
15 Ọ ga-erukwa na a ga-agba onye ọ bụla a họọrọ nke ji ihe ahụ a ga-ebibi ebibi ọkụ,+ ya na ndị niile bụ́ nke ya, n’ihi na o mebiwo ọgbụgba ndụ+ Jehova nakwa n’ihi na o mewo ihe nzuzu na-eweta ihere n’Izrel.”’”+