26 Ewebatala ihe arụ n’ụlọ gị, i wee ghọọ ihe a ga-ebibi ebibi dị ka ya. Ị ga-asọ ya oyi nke ukwuu ma kpọ ya ajọ asị,+ n’ihi na ọ bụ ihe a ga-ebibi ebibi.+
17 Obodo a ga-abụkwa ihe a ga-ebibi ebibi;+ ya na ihe niile dị n’ime ya bụ nke Jehova. Naanị Rehab+ nwaanyị akwụna ahụ ga-adị ndụ, ya na ndị niile ya na ha nọ n’ụlọ, n’ihi na o zoro ndị ozi ahụ anyị zipụrụ.+