28 Jọshụa wee weghara Makida+ n’ụbọchị ahụ ma were ihu mma agha bibie ya.+ O gbukwara eze ya na mkpụrụ obi ọ bụla nọ na ya. Ọ hapụghị onye ọ bụla ndụ. O wee mee eze Makida+ ihe o mere eze Jeriko.
3 Ọ bụrụ na ha ezoo n’elu ugwu Kamel, m ga-achọ ha nke ọma n’ebe ahụ. M ga-ejiderịrị ha.+ Ọ bụrụkwa na ha ezoo n’ala ala oké osimiri+ ka m ghara ịhụ ha, m ga-enye agwọ iwu ka ọ taa ha n’ebe ahụ.