18 N’ụbọchị ahụ, Jehova na Ebram gbara ndụ,+ o wee sị: “Ọ bụ mkpụrụ gị ka m ga-enye ala a,+ malite n’osimiri Ijipt ruo n’osimiri ukwu, bụ́ osimiri Yufretis:+
3 (malite na ngalaba Osimiri Naịl nke dị n’ihu Ijipt ruo n’ókè Ekrọn n’ebe ugwu,+ a na-ewerebu ya dị ka nke ndị Kenan);+ ndị isi ise+ nke ndị Filistia, ndị Geza+ na ndị Ashdọd,+ ndị Ashkelọn,+ ndị Gat+ na ndị Ekrọn;+ na ndị Avim.+
65 Sọlọmọn wee mee ememme+ ahụ n’oge ahụ, ya na Izrel dum, bụ́ ọgbakọ dị ukwuu,+ malite n’ebe e si abanye Hemat+ gbadaruo ndagwurugwu Ijipt,+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị ụbọchị asaa nakwa ụbọchị asaa ọzọ,+ ya bụ, ụbọchị iri na anọ.