8 M na-agbada ịga napụta ha n’aka ndị Ijipt+ nakwa ịkpọpụta ha n’ala ahụ kpọga ha n’ala dị mma, dịkwa obosara, n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ n’ógbè ndị Kenan na ndị Het na ndị Amọraịt na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt nakwa ndị Jibọs.+
7“Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-emesị kpọbata gị n’ala ahụ ị na-abanye inweta,+ ọ ga-ekpochapụ mba ndị nwere ụba mmadụ n’ihu gị,+ bụ́ ndị Het+ na ndị Gegash+ na ndị Amọraịt+ na ndị Kenan+ na ndị Perizaịt+ na ndị Haịvaịt+ na ndị Jibọs,+ mba asaa ndị nwere ụba mmadụ ma dị ike karịa gị.+