15 O wee ruo na ozugbo Gidiọn nụrụ nrọ ahụ a kọrọ na nkọwa ya,+ ọ kpọrọ isiala.+ E mesịa, ọ laghachiri n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu wee sị: “Bilienụ,+ n’ihi na Jehova enyefewo ndị agha Midian n’aka unu.”
47 Ìgwè mmadụ a dum ga-amara na Jehova adịghị eji mma agha ma ọ bụ ube eweta nzọpụta,+ n’ihi na ọ bụ Jehova nwe agha a,+ ọ ga-enyefekwa unu n’aka anyị.”+