47 Ìgwè mmadụ a dum ga-amara na Jehova adịghị eji mma agha ma ọ bụ ube eweta nzọpụta,+ n’ihi na ọ bụ Jehova nwe agha a,+ ọ ga-enyefekwa unu n’aka anyị.”+
17 Unu agaghị alụ ọgụ+ na nke ugbu a. Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ, guzoronụ otu ebe+ hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu.+ Juda na Jeruselem, unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ.+ Echi gakwurunụ ha, Jehova ga-anọnyekwara unu.’”+