9 Ma, unu enupụrụla Jehova isi;+ unu atụla ndị ala ahụ egwu,+ n’ihi na ha bụụrụ anyị ihe oriri. Ihe nchebe ha adịkwaghị,+ Jehova nọnyeere anyị.+ Unu atụla ha egwu.”+
2 O wee gakwuru Esa sị ya: “Geenụ m ntị, Esa na Juda na Benjamin dum! Jehova ga-anọnyere unu ma ọ bụrụhaala na unu adịnyere ya;+ ọ bụrụ na unu achọọ+ ya, ọ ga-ekwe ka unu chọta ya, ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu.+