9 O wee sị: “M ga-eso gị gaa. Naanị na ọ bụghị gị ga-enweta otuto n’ihe a ị na-aga, n’ihi na ọ bụ nwaanyị+ ka Jehova ga-ewere Sisera resị.” Debora wee bilie soro Berak gaa Kidesh.+
21 Ònye gburu Abimelek+ nwa Jerọbeshet?+ Ọ́ bụghị nwaanyị nọ n’elu mgbidi tụọ ya aka nkume igwe nri,+ o wee nwụọ na Tibez?+ Gịnị mere unu ji jeruo mgbidi ahụ oké nso?’ sị ya, ‘Onye na-ejere gị ozi bụ́ Yuraya onye Het nwụkwara.’”+
22 Ozugbo ahụ, nwaanyị ahụ ji amamihe+ gakwuru ndị obodo ya niile, ha wee gbupụ Shiba nwa Bikraị isi wee tụọrọ ya Joab. O wee fụọ opi,+ ha wee si n’obodo ahụ lasasịa, onye ọ bụla wee laa n’ụlọ ya; Joab wee laghachikwuru eze na Jeruselem.