24 “‘Bilienụ, kwalienụ gafee iyi ndagwurugwu Anọn.+ Lee, enyefewo m Saịhọn+ eze Heshbọn, bụ́ onye Amọraịt, n’aka gị. Ya mere, malite iweghara ala ya, busokwa ya agha.
2 Jehova wee sị m, ‘Atụla ya egwu,+ n’ihi na m ga-enyefe ya na ndị ya niile na ala ya n’aka gị; mee ya ihe i mere Saịhọn+ eze ndị Amọraịt, onye biri na Heshbọn.’
2 Saịhọn+ eze ndị Amọraịt, onye biri na Heshbọn,+ bụ́ onye na-achị malite n’Aroa+ nke dị n’akụkụ iyi ndagwurugwu Anọn,+ na etiti ndagwurugwu ahụ, na ọkara nke Gilied ruo Jabọk+ bụ́ iyi ndagwurugwu, nke bụ́ ókè nke ala ụmụ Amọn,