12 Anyị wee weghara ala a n’oge ahụ; enyewo m ụmụ Ruben na ụmụ Gad+ ala malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ iyi ndagwurugwu Anọn, na ọkara ógbè Gilied nke bụ́ ugwu ugwu nakwa obodo ya dị iche iche.
13 Enyewokwa m ọkara ebo Manase ebe fọdụrụ na Gilied+ nakwa Beshan+ dum nke dị n’alaeze Ọg. Ógbè Agọb+ dum nke dị na Beshan dum, ọ̀ bụ na a dịghị akpọ ya ala ndị Refeyim?+