48 Ị ga na-ejere ndị iro gị, bụ́ ndị Jehova ga-ezite ibuso gị agha, ozi.+ Agụụ ga na-agụ gị,+ akpịrị ga na-akpọ gị nkụ, ị ga-agbakwa ọtọ ma nọrọ n’ụkọ ihe niile mgbe ị na-ejere ha ozi; ọ ga-anyawakwa gị yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara gị n’iyi.+
11 Puku ndị Juda atọ wee gbadaa n’ọgba nnukwu nkume Itam+ wee sị Samsịn: “Ọ̀ bụ na ị maghị na ọ bụ ndị Filistia na-achị anyị?+ Gịnịzi ka ihe a i mere anyị pụtara?” O wee sị ha: “Emere m ha dị nnọọ ka ha mere m.”+