19 Ọ na-erukwa na mgbe onyeikpe ahụ nwụrụ, ha na-atụgharị mewe omume na-eweta mbibi karịa otú ndị nna ha mere site n’isoro chi ọzọ dị iche iche iji na-efe ha ofufe ma na-akpọrọ ha isiala.+ Ha akwụsịghị omume ha na àgwà isi ike ha.+
6 Ụmụ Izrel wee malite ọzọ ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova,+ ha malitekwara ife Bel+ na ihe oyiyi Ashtọret+ na chi ndị Siria+ na chi ndị Saịdọn+ na chi ndị Moab+ na chi ụmụ Amọn+ na chi ndị Filistia.+ Ha wee hapụ Jehova, ha efeghịkwa ya.+