20 Neomi wee sị nwunye nwa ya: “Ka Jehova, bụ́ onye na-ewepụghị obiọma*+ ya n’ebe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ nọ,+ gọzie ya.”+ Neomi wee sị ya: “Nwoke ahụ bụ onye ikwu anyị.+ Ọ bụ otu n’ime ndị ga-agbara ihe anyị.”+
5 Boaz wee sị: “Ụbọchị ị zụrụ Neomi ala ahụ, ọ bụkwa Rut nwaanyị Moab, bụ́ nwunye nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka ị ga-azụ ya ka i mee ka aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ dịgide n’ihe nketa ya.”+