11 Juda wee gwa Tema nwunye nwa ya, sị: “Biri dị ka nwaanyị di ya nwụrụ n’ụlọ nna gị ruo mgbe Shila nwa m tolitere.”+ N’ihi na ọ gwara onwe ya, sị: “O nwekwara ike ịnwụ dị ka ụmụnne ya.”+ N’ihi ya, Tema gara biri n’ụlọ nna ya.+
5 “Ọ bụrụ na ụmụnne bikọta ọnụ, otu n’ime ha anwụọ n’enweghị nwa nwoke, nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ agaghị abụ nwunye nwoke ọzọ n’èzí. Nwanne di ya ga-agakwuru ya, ọ ga-akpọrọkwa ya ka ọ bụrụ nwunye ya wee kuchie ya.+