13 N’ebe ahụ ka ha si kwalie wee maa ụlọikwuu n’ógbè Anọn,+ nke dị n’ala ịkpa nke malitere n’ókè ndị Amọraịt; n’ihi na Anọn bụ ókè Moab, ya bụ, ókè Moab na ndị Amọraịt.
1O wee ruo n’oge ọ bụ ndị ikpe+ na-ekpe ikpe na ụnwụ+ dara n’ala Izrel, otu nwoke wee si na Betlehem+ nke dị na Juda gawa n’ala Moab+ ka ha biri dị ka ọbịa, ya na nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom abụọ.