3 Eze wee sị: “Ọ̀ bụ na ọ dịghị onye ọzọ fọdụrụ n’ụlọ Sọl, ka m wee gosi ya obiọma Chineke?”+ Zaịba wee sị eze: “A ka nwere nwa Jọnatan, bụ́ onye dara ngwọrọ.”+
7 Devid wee sị ya: “Atụla egwu, n’ihi na aghaghị m igosi gị obiọma+ n’ihi Jọnatan nna gị;+ m ga-enyeghachikwa gị ala+ niile bụ́ nke Sọl nna nna gị, gị onwe gị ga na-erikwa nri na tebụl mụ mgbe niile.”+