7 Sọl wee gwa ndị na-ejere ya ozi bụ́ ndị guzo ya gburugburu, sị: “Biko, geenụ ntị, unu ndị Benjamin. Nwa Jesi+ ọ̀ ga-enye unu niile ala na ubi vaịn?+ Ọ̀ ga-ahọpụta unu niile ka unu bụrụ ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha+ na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha?