10 A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke na-esure* nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ,+ onye ọ bụla nke na-agba afa,+ onye na-eme anwansi+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu+ ma ọ bụ dibịa anwansi,+
13 Sọl wee si otú a nwụọ n’ihi omume ekwesịghị ntụkwasị obi ya nke o ji enweghị okwukwe+ meso Jehova n’ihe metụtara okwu Jehova nke ọ na-edebeghị nakwa n’ihi ịgwa onye na-agba afa+ ka ọ jụọrọ ya ase.
19 Ọ bụrụkwa na ha asị unu: “Jụọnụ ndị na-agba afa ase+ ma ọ bụ ndị nwere mmụọ ịkọ ọdịnihu, bụ́ ndị na-ebe ubé,+ na-ekwukwa okwu n’olu dị ala,” ọ́ bụghị Chi ha ka ndị ọ bụla kwesịrị ịjụ ase?+ È kwesịrị ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase maka ndị dị ndụ?+