11 Ma ọ dịghị onye Devid hapụrụ ndụ, ma nwoke ma nwaanyị, ka ọ kpọrọ ha lọta na Gat, n’ihi na ọ sịrị: “Ka ha ghara ịgbabọ anyị, sị, ‘Ọ bụ otú a ka Devid mere.’”+ (Ọ bụkwa otú a ka ọ na-eme n’ụbọchị niile o biri n’ime ime obodo ndị Filistia.)
12 N’ihi ya, Ekish kwetara ihe Devid kwuru,+ wee sị n’obi ya: “N’ezie, ọ ghọwo ihe na-esi ísì n’etiti ndị ya Izrel;+ ọ ga-abụkwa onye na-ejere m ozi ruo mgbe a na-akaghị aka.”
3 Ndị isi ndị Filistia wee malite ịsị: “Gịnị ka ndị Hibru+ a bu n’obi?” Ekish wee gwa ndị isi ndị Filistia, sị: “Onye a ọ́ bụghị Devid onye na-ejere Sọl eze Izrel ozi, onye mụ na ya nọrọ n’ebe a otu afọ ma ọ bụ afọ abụọ,+ ahụghịkwa+ m ihe ọ bụla o mere malite n’ụbọchị ọ gbakwutere m ruo taa?”