17 Ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ,+ ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli m. Ka Jehova mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe+ na ya ma ọ bụrụ na ọ bụghị naanị ọnwụ ga-ekewa mụ na gị.”
13 Ọ bụrụ na nna m achọọ ime gị ihe ọjọọ, ma akọghịrị m gị ya wee mee ka ị gbalaga, i wee ghara ịla n’udo, ka Jehova mee Jọnatan otú a, ka ọ tụkwasịkwa+ ihe na ya. Ka Jehova nọnyere gị,+ dị nnọọ ka ọ nọnyeere nna m.+
13 Gwakwanụ Amesa, sị,+ ‘Ọ̀ bụ na mụ na gị abụghị otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́? Ka Chineke mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya+ ma ọ bụrụ na ị gaghị abụ onyeisi ndị agha n’ihu m mgbe niile n’ọnọdụ Joab.’”+