6Jehova wee gwa Mozis, sị: “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m gaje ime Fero,+ n’ihi na ọ bụ aka dị ike ga-eme ka ọ hapụ ha ka ha laa, ọ bụkwa aka dị ike ga-eme ka ọ chụpụ ha n’ala ya.”+
11Jehova wee gwa Mozis, sị: “M gaje iti Fero na Ijipt otu ihe otiti ọzọ. E mesịa, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.+ N’oge ọ ga-ahapụ unu kpamkpam ka unu laa, ọ ga na-achụ unu achụ ka unu si n’ebe a pụọ.+