19 Ma unu onwe unu—taa ka unu jụrụ Chineke+ unu bụ́ onye zọpụtara unu n’ihe ọjọọ unu niile nakwa n’ahụhụ unu, unu wee sị: “Ee e, kama ọ bụ eze ka ị ga-eme ka ọ chịwa anyị.” Ugbu a, guzonụ n’ihu Jehova n’ebo n’ebo+ nakwa n’ìgwè dị otu puku mmadụ otu puku mmadụ.’”
12 Mgbe unu hụrụ na Nehash,+ bụ́ eze ụmụ Amọn abịawo ibuso unu agha, unu nọ na-asị m, ‘Ee e, kama ọ bụ eze ga na-achị anyị!’+ ma n’oge ahụ niile, ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu bụ Eze unu.+