22 Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel Sọlọmọn ji mere ohu;+ n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị agha na ndị na-ejere ya ozi na ndị o mere ndị isi na ndị na-esote ndị isi agha ya na ndị isi nke ndị na-anya ụgbọ ịnyịnya ya na ndị isi nke ndị na-agba ịnyịnya ya.+
26 Sọlọmọn wee na-enweta ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya agha; o wee nwee otu puku ụgbọ ịnyịnya na narị anọ nakwa puku ịnyịnya agha iri na abụọ.+ O wee debe ha n’obodo dị iche iche a na-edebe ụgbọ ịnyịnya nakwa n’ebe dị eze nso na Jeruselem.+