11 N’ihi na ọ bụ naanị Ọg eze Beshan fọdụrụ ndụ n’ime ndị Refeyim fọdụrụnụ.+ Lee! E ji ígwè rụọ ihe o ji ebu ozu. Ọ́ bụghị na Raba+ nke ụmụ Amọn ka ọ dị? Ọ dị kubit itoolu n’ogologo, dịrịkwa kubit anọ n’obosara, ma e jiri kubit nkịtị tụọ ya.
20 Agha wee daa ọzọ na Gat,+ mgbe e nwere otu nwoke gbara ajọ dimkpa, nke nwere mkpịsị aka isii n’aka ya nke ọ bụla, nweekwa mkpịsị ụkwụ isii n’ụkwụ ya nke ọ bụla, iri abụọ na anọ ka ha niile dị; ya onwe ya kwa bụ otu n’ime ụmụ ndị Refeyim.+