9E nwere otu nwoke bụ́ onye ebo Benjamin, aha ya bụ Kish,+ nwa Abayel, nwa Ziroa, nwa Bikorat, nwa Afaya, onye ebo Benjamin,+ ọ bụ nwoke bara ezigbo ọgaranya.+
11 O wee ruo na mgbe ndị niile mabu ya hụrụ ya, lee! o so ndị amụma na-ebu amụma. Ndị ahụ wee gwa ibe ha, sị: “Gịnị bụ ihe a na-eme nwa Kish? Sọl ò sokwu ná ndị amụma?”+