25 Sọl wee sị: “Nke a bụ ihe unu ga-agwa Devid, ‘Ọ bụghị ego isi nwaanyị+ ka eze chọrọ, kama ọ bụ otu narị apị́+ ndị Filistia, ka eze wee bọọrọ onwe ya ọbọ+ n’ahụ́ ndị iro ya.” Ma Sọl kpara nkata ka ndị Filistia gbuo Devid.
27 Devid wee bilie, ya na ndị ikom ya gaa gbuo+ narị ndị ikom abụọ n’etiti ndị Filistia, Devid wee chịtara eze apị́+ niile ọ sịrị ya weta, ka ya na eze wee gọọ ọgọ. Sọl wee kpọnye ya Maịkal nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.+