28 Finihas+ nwa Elieza, nwa Erọn, guzo n’ihu ya n’oge ahụ,+ sị: “Ọ̀ bụ m gaa ọzọ buso ụmụ Benjamin nwanne m agha ka ọ̀ bụ mụ agala?”+ Jehova wee sị ya: “Gaa, n’ihi na echi ka m ga-enyefe ya n’aka gị.”+
8 Devid wee malite ịjụ Jehova ase,+ sị: “Ọ̀ bụ m chụwa ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga nke a? M̀ ga-achụkwu ha?” O wee zaa ya,+ sị: “Chụwa ha, n’ihi na ị ga-achụkwu ha, ị ga-anapụtakwa ha ihe niile.”+