11 N’ikpeazụ, Samuel sịrị Jesi: “Ọ̀ gwụla ndị a bụ ụmụ gị ndị ikom?” O wee sị: “Onye fọrọ ugbu a bụ nke ọdụdụ,+ lee! ọ na-azụ atụrụ.”+ Samuel wee sị Jesi: “Zie ozi ka a gaa kpọta ya, n’ihi na anyị agaghị anọdụ ala rie nri ruo mgbe ọ bịara n’ebe a.”
7 “Nke a bụ ihe ị ga-agwa ohu m Devid, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Mụ onwe m si n’ala ịta ahịhịa, n’ebe ị na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ,+ kpọrọ gị ka ị bụrụ onye ndú+ nke ndị m Izrel.