19 Dị ka à ga-asị na nke a bụ ihe nta n’anya gị, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ị na-ekwukwa ihe ga-eme mgbe dị anya n’ọdịnihu banyere ụlọ ohu gị; nke a bụkwa iwu e nyere ụmụ mmadụ,+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova.+
17 Ezi onyinye+ ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa,+ n’ihi na ọ na-esi n’aka Nna nke ìhè eluigwe abịa,+ ọ dịghị agbanwe agbanwe, ọ dịghị ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.+