7 Ókè ya gbagokwara Diba n’ebe ndagwurugwu Ekọ+ ma chee ihu n’ebe ugwu ruo Gilgal,+ bụ́ nke dị n’ihu ebe e si agbago Adọmịm, nke dị na ndịda iyi ndagwurugwu; ókè ya gafekwara ruo mmiri En-shimesh,+ ebe o jedebere bụ En-rogel.+
16 Ókè ya gbadara na nsọtụ ugwu nke chere ihu na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ nke dị na ndagwurugwu Refeyim+ n’ebe ugwu. Ọ gbadakwara na ndagwurugwu Hinọm, ná mkpọda nke obodo ndị Jibọs,+ gbadaruokwa n’En-rogel.+
9 E mesịa, Adọnaịja chụrụ atụrụ na ehi na anụ ndị mara abụba n’àjà+ n’ebe dị nso na nkume Zohelet, nke dị n’akụkụ En-rogel,+ o wee kpọọ ụmụnne ya niile bụ́ ụmụ ndị ikom+ eze na ndị ikom niile nke Juda bụ́ ndị na-ejere eze ozi;