2 Eze wee jụọ Zaịba, sị: “Gịnị ka ihe ndị a i bu pụtara?”+ Zaịba wee zaa, sị: “Ịnyịnya ibu ndị a bụ nke ezinụlọ eze ga na-agba, achịcha ndị a na mkpụrụ osisi ndị a na-amị n’oge okpomọkụ bụ nke ụmụ okorobịa+ ga-eri, mmanya a bụ nke onye ike gwụrụ+ n’ala ịkpa.”+