14 Ọ bụrụkwa na i jee ije n’ụzọ m site n’idebe ụkpụrụ+ m na ihe m nyere n’iwu, dị nnọọ ka Devid bụ́ nna gị jere,+ m ga-emekwa ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo.”+
5 n’ihi na Devid mere ihe ziri ezi n’anya Jehova, ọ hapụghịkwa ihe ọ bụla O nyere ya n’iwu n’ụbọchị niile nke ndụ ya,+ ma e wezụga n’ihe banyere Yuraya onye Het.+