Diuterọnọmi 25:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ị ga-enwe naanị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi ma zuo ezu. Ọ bụ naanị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ziri ezi ma zuo ezu ka ị ga-enwe, ka ụbọchị gị wee dị ogologo n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị.+ Abụ Ọma 21:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ. I wee nye ya,+Nyekwa ya ogologo ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Abụ Ọma 91:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 M ga-eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya,+M ga-emekwa ka ọ hụ nzọpụta m.+ Ilu 3:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Ogologo ndụ dị n’aka nri ya;+ akụnụba na ùgwù dịkwa n’aka ekpe ya.+
15 Ị ga-enwe naanị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi ma zuo ezu. Ọ bụ naanị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ziri ezi ma zuo ezu ka ị ga-enwe, ka ụbọchị gị wee dị ogologo n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị.+
4 Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ. I wee nye ya,+Nyekwa ya ogologo ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+