Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid.
21 Jehova, ọ bụ n’ike gị ka eze na-aṅụrị ọṅụ;+
Leekwa ka o si chọọ ịdị na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu ná nzọpụta gị!+
2 I nyewo ya ihe na-agụ obi ya,+
Ị jụghị inye ya ihe egbugbere ọnụ ya chọrọ.+ Sila.
3 N’ihi na ị gọziri ya wee nye ya ihe ọma,+
I kpuwekwara ya okpueze ọlaedo a nụchara anụcha n’isi.+
4 Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ. I wee nye ya,+
Nyekwa ya ogologo ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+
5 Ọ dị ebube nke ukwuu n’ihi nzọpụta gị.+
I yiwe ya ebube na ịma mma dị ka uwe.+
6 N’ihi na ị na-eme ka ọ bụrụ onye a gọziri agọzi nke ukwuu ruo mgbe ebighị ebi;+
Ị na-eji ọṅụ nke si n’ihu gị eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.+
7 N’ihi na eze tụkwasịrị Jehova obi,+
Tụkwasịkwa obi n’obiọma nke Onye Kasị Elu. A gaghị eme ka ọ maa jijiji.+
8 Aka gị ga-enweta ndị iro gị niile;+
Aka nri gị ga-enweta ndị kpọrọ gị asị.
9 Ị ga-eme ka ha dị ka oké ọkụ nke na-enwu enwu n’oge a kara aka mgbe ị ga-eche ihu n’ebe ha nọ.+
Jehova ga-eloda ha n’iwe ya, ọkụ ga-erepịakwa ha.+
10 Ị ga-ekpochapụ mkpụrụ ha n’ụwa,+
Kpochapụkwa ụmụ ha n’etiti ụmụ mmadụ.+
11 N’ihi na ha emewo atụmatụ ime gị ihe ọjọọ;+
Ha echepụtawo ihe ha na-apụghị imezu.+
12 N’ihi na ị ga-eji eriri ụta gị nke ị kwadebere iji buso ha agha+
Mee ka ha tụgharịa gbaa ọsọ.+
13 Jehova, ka e bulie gị elu n’ike gị.+
Anyị ga-abụ abụ, bụọkwa abụ olu ụtọ banyere ịdị ike gị.+