Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid.
20 Ka Jehova za gị n’ụbọchị ahụhụ.+
Ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.+
2 Ka o si n’ebe nsọ+ zitere gị enyemaka,
Sikwa na Zayọn kwado gị.+
3 Ka o cheta onyinye inweta ihu ọma gị niile,+
Ka ọ narakwa àjà nsure ọkụ gị dị ka à ga-asị na ọ bụ abụba.+ Sila.
4 Ka o nye gị ihe obi gị chọrọ,+
Ka o mezuokwa ebumnobi gị niile.+
5 Anyị ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi nzọpụta gị,+
Anyị ga-ebulikwa ọkọlọtọ anyị n’aha Chineke anyị.+
Ka Jehova mezuo ihe niile ị na-arịọ.+
6 Ugbu a ka m maara na Jehova na-azọpụta onye o tere mmanụ.+
Ọ na-eji oké ọrụ nzọpụta nke aka nri ya na-arụ+
Nọrọ n’eluigwe ya dị nsọ za ya.+
7 Ụfọdụ na-ekwu banyere ụgbọ ịnyịnya, ndị ọzọ na-ekwu banyere ịnyịnya,+
Ma anyị onwe anyị ga na-ekwu banyere aha Jehova bụ́ Chineke anyị.+
8 Ha onwe ha adawo mbà wee daa;+
Ma anyị onwe anyị ebiliwo, ka e wee mee ka anyị kwụrụ chịm.+
9 Jehova, biko, zọpụta eze!+
Ọ ga-aza anyị n’ụbọchị anyị kpọrọ ya.+