Ọpụpụ 17:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 N’ikpeazụ, Mozis tikuru Jehova, sị: “Gịnị ka m ga-eme ndị a? Obere oge ugbu a ha ga-atụ m nkume!”+ Ọnụ Ọgụgụ 14:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Otú ọ dị, nzukọ ahụ dum kwuru ka a tụọ ha nkume.+ Ebube Jehova wee pụta ìhè n’ụlọikwuu nzute, n’ihu ụmụ Izrel niile.+ 2 Ihe E Mere 10:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Eze Rehoboam wee ziga Hedoram,+ bụ́ onye na-elekọta ndị a kpọọrọ ịrụ ọrụ mmanye, ma ụmụ Izrel ji nkume tụgbuo ya.+ Ma Eze Rehoboam jisiri ike rịgoro n’ụgbọ ịnyịnya gbalaa Jeruselem.+ 2 Ihe E Mere 24:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 N’ikpeazụ, ha gbaara ya izu+ wee were nkume tụgbuo ya+ n’ogige ụlọ Jehova dị ka ihe eze nyere n’iwu si dị. Ọrụ Ndịozi 5:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 Mgbe ahụ, onyeisi ndị nche ụlọ nsọ ahụ na ndị ọrụ ya pụrụ wee kpọta ha, ma ha emeghị ya n’ike, ebe ha na-atụ egwu+ ka ndị mmadụ ghara ịtụ ha nkume.
10 Otú ọ dị, nzukọ ahụ dum kwuru ka a tụọ ha nkume.+ Ebube Jehova wee pụta ìhè n’ụlọikwuu nzute, n’ihu ụmụ Izrel niile.+
18 Eze Rehoboam wee ziga Hedoram,+ bụ́ onye na-elekọta ndị a kpọọrọ ịrụ ọrụ mmanye, ma ụmụ Izrel ji nkume tụgbuo ya.+ Ma Eze Rehoboam jisiri ike rịgoro n’ụgbọ ịnyịnya gbalaa Jeruselem.+
21 N’ikpeazụ, ha gbaara ya izu+ wee were nkume tụgbuo ya+ n’ogige ụlọ Jehova dị ka ihe eze nyere n’iwu si dị.
26 Mgbe ahụ, onyeisi ndị nche ụlọ nsọ ahụ na ndị ọrụ ya pụrụ wee kpọta ha, ma ha emeghị ya n’ike, ebe ha na-atụ egwu+ ka ndị mmadụ ghara ịtụ ha nkume.