34 N’aka nke ọzọ, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke Izrel dị ndụ, onye gbochiri m ime gị ihe ọjọọ,+ a sị na i meghị ngwa wee bịakwute m,+ a garaghị enwe onye ga-afọdụrụ Nebal ma chi bọọ, ya bụ, onye ọ bụla bụ́ nwoke.”+
11 O wee ruo na mgbe ọ malitere ịchị, ozugbo ọ nọkwasịrị n’ocheeze ya, o gburu ndị ezinụlọ Beasha niile. O kweghị ka onye ya ọ bụla nke bụ́ nwoke+ ma ọ bụ ndị ga-abọrọ ya ọbọ ọbara+ ma ọ bụ ndị enyi ya fọdụ.
8 Ụlọ Ehab dum ga-alakwa n’iyi; m ga-ebipụkwa onye ọ bụla bụ́ nwoke+ nke si n’ahụ́ Ehab+ na onye ọ bụla na-enweghị enyemaka na onye na-abaghị n’ihe+ n’Izrel.