20 N’ihi na m ga-eduba ha n’ala ahụ m ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi inye ha,+ nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ ha ga-erikwa ihe+ wee rijuo afọ ma maa abụba+ wee gakwuru chi ọzọ dị iche iche,+ ha ga-efekwa ha ofufe ma lelịa m, mebiekwa ọgbụgba ndụ m.+
4 Ahụhụ ga-adịrị mba nke na-eme mmehie,+ ndị njehie na-anyịgbu, mkpụrụ nke na-eme ihe ọjọọ,+ ụmụ na-eweta mbibi!+ Ha ahapụwo Jehova,+ ha elelịwokwa Onye Nsọ Izrel,+ ha alaghachiwo azụ.+