16 Ọ bụ naanị na ọ gaghị eme ka ịnyịnya ya dị ọtụtụ,+ ma ọ bụ mee ka ndị Izrel laghachi n’Ijipt iji mee ka ịnyịnya dị ọtụtụ;+ ebe ọ bụ na Jehova agwawo unu, sị, ‘Ya adịla mgbe unu ga-esi n’ụzọ a laghachi azụ ọzọ.’
4 Devid wee jide otu puku na narị mmadụ asaa ya bụ́ ndị na-agba ịnyịnya nakwa puku mmadụ abụọ bụ́ ndị ji ụkwụ aga;+ Devid wee see+ ịnyịnya ụgbọala+ niile ha akwara, ma ọ hapụrụ otu narị ịnyịnya ụgbọala n’ime ha.
25 Kwa afọ,+ onye ọ bụla n’ime ha na-eweta onyinye,+ bụ́ ihe ndị e ji ọlaọcha mee+ na ihe ndị e ji ọlaedo mee na uwe na ihe agha+ na mmanụ bọlsọm, ịnyịnya na ịnyịnya ibu.+
17 Ha na-eji narị mkpụrụ ego ọlaọcha isii esi n’Ijipt azụbata otu ụgbọ ịnyịnya, ha na-ejikwa otu narị mkpụrụ ego ọlaọcha na iri ise azụbata otu ịnyịnya; ọ bụkwa otú ahụ ka ndị eze niile nke ndị Het na ndị eze Siria+ si azụbata ha. Ọ bụ n’aka ndị eze a ka ha si azụbata ha.