10 O wee nye+ eze ọlaedo dị otu narị talent na iri abụọ+ na mmanụ bọlsọm+ dị nnọọ ukwuu na nkume dị oké ọnụ ahịa. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ e butere mmanụ bọlsọm dị ukwuu ka nke ahụ eze nwaanyị Shiba buteere Eze Sọlọmọn.
21 E ji ọlaedo mee arịa niile Eze Sọlọmọn ji aṅụ ihe ọṅụṅụ, e jikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa+ mee arịa niile dị n’Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn.+ Ọ dịghị ihe ọ bụla e ji ọlaọcha mee; a gụrụ ya dị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ ma ọlị n’ụbọchị Sọlọmọn.